Author Topic: Nkata Igbo  (Read 33351 times)

tsly

  • Posts: 58
Nkata Igbo
« on: February 27, 2005, 05:40:26 AM »
Eche cha la m, madu ole ebe nwere ike ikpa nkata na igbo? Tinye rikom ebe kwesiri rikom. ANyi na asu asusu bekee, mana asi anyi dey okwu igbo, onye nile elewa anya elu elu.

A ma m na igbo m adighi mma, mana a ga m e dechapu okwu na igbo. Onye ola dey ihe masiri ya.

Aririo ka m na ario unu, onye choro i dey okwu ebe a, dey ya so na igbo. Okwu igbo di iche iche. Beko, acho nyim onye ga e ji okwu bekee mebie nkata anyi na a kpa ebe a!

Prince

  • Posts: 438
Nkata Igbo
« Reply #1 on: February 27, 2005, 07:26:55 PM »
Igbo kwe nu!
Igbo a na acho-acho, kwe nu!
Igbo a na-eji a ga ogu, kwezuo nu!

Eeaaaah,  he-he-hem.  
Eeeem, dika unu ma, idi Igbo kwuru si, \"mma ekwu fue, onye huwara ji a puta.\"  

Nna m siri, \"e kowe ulo, e kotere ndi oglogo.\"

Ihe mu na-acho i kwu bu nkea: Ihe nwanne anyi nwoke, bu Tsly, weputara n\'ebea di mma.  Okwu Igbo dika oji, onye wetere ya, wetere ndu.  Ugbua, Tsly e wetala ndu.  A nam asi ka onye obula nyere m aka na-isi Tsly, \"ndewo\" maka ihe oma nke o wetara.

Ihe ozo m\'choro i kwu bu nkea.  Okwu Igbo dika ji, i huwa ya ma i hugharighi ya, o refue n\'oku.  A choro m ka onye obula were ohere nkea na-ahughari ji ya, ka o ghara irefu n\'oku.

Onye obula nye aka ka ihea Tsly bidoro ghara ida, n\'ihi na, e zue-ezue nyuo mamiri, o gbaa ufufu.

Ndewo nu.
He who knows not, and knows not that he knows not, is a fool.

If you s-m-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-l-l-l-l-l-l-l what the Prince - is - cooking!!

(Adapted from WWE’s Rock.)

tsly

  • Posts: 58
Nkata Igbo
« Reply #2 on: February 27, 2005, 09:08:27 PM »
Ogaranya prince, a na m ekele. Okwu oma ikwuru toro m uto na obi. Odika dimkpa si ubi bata, ewere ngwo nye ya.

Nno! ndi no ebe a. Egwu atula unu.  Soronu anyi kpa nkata.
Ka ogazie

Chizi

  • Posts: 66
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #3 on: February 28, 2005, 09:02:08 AM »
Ndi Igbo, ndewo nu o. Chineke nna mu, Ihe nka nwanne anyi bu tsly chetara atogbuola onwe ya. O nyerem obi anuri nke ukwu. Ndi Igbo anyi na asi  \"Ilu bu mmanu nri ndi Igbo ji eri ji.\" Ekwere mu na okwu a, mana adichaghi mu mma na iji ilu ekwu okwu Igbo. Papa mu na papa mu nkeukwu gbaliri nga ike ha ruru, ikusiri mu na umu nnem otu anyi kwesiri isi ji ilu choo okwu anyi mma, mana unu ma umuaka ugbua... Otu na otuowula ihe siri di, tsly, igbaliala. Ndewo maka otu isi chetara anyi ebe anyi si, o bu odu ihe ndia na ebute oganihu. Otu ihe gbatara mu n\'obi ugbua bu nke a; ndi ma ilu Igbo nwere ike iji ohere a nyetu anyi ako n\'uche ha, kowara anyi bu ndi nke nta ka na eto eto ihe ilu ndi a gosiri, adi ama ma. Onye owula wete nke ha ji biko. Ihe nke a nwanne anyi nwoke bu tsly weputara bu ihe oma, ka anyi nyere ya aka me ya ka o gaa nke oma. Ka anyi jiri ya meputa ihe di mma ka o hapu ifu okporo okporo. Ndewo nu.
<div>Little minds are subdued by misfortune, but great minds rise by it. <br /></div>

uapo4

  • Posts: 559
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #4 on: February 28, 2005, 08:48:56 PM »
Nna, ihe atogbula m nke ukuu. Ihe nchoro ikwu bu Chukwu gozie anyi n\'ile - nwoke na nwanyi. Onye nwe iro na igbo nya nye anyi ebenwa. A gam a cho igu iro mbekwu na osa anyi nwere na mgbe anyi di ntakiri. Chukwu gozie obodo anyi bu Nigeria na ndi nine na acho oga n\'ihu.
"Incline Thy ear, O Lord, and hear me: for I am needy and poor" -- Psalm lxxxv. 1

chizor

  • Posts: 191
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #5 on: March 01, 2005, 04:38:05 AM »
Tsly di anyi! i meela ihe oma. O teela kemgbe m dere okwu igbo, mana a si m na m ga agbali dee ihe ebe a. O na ato m uto nke ukwu, mana m ga akwusi ebe a. n\'ihi na achoghi m ikoyeri wa. Ka emesia.
Whenever I see an old lady slip and fall on a wet sidewalk, my first instinct is to laugh. But then I think, what if I was an ant, and she fell on me. Then it wouldn\'t seem quite so funny.
--Jack Handey,

okey

  • Posts: 220
Nkata Igbo
« Reply #6 on: March 01, 2005, 05:21:10 AM »
Umunne na umunna kwenu! A na m ekele.

Ka m le mmadu ole nwere ike idenwu okwu igbo.
Tsly na ndi dere ihe odide ebe a, gisie nu ike. Prince, okwu gi torom uto nke oma.
===
Quality is never an accident; It is always the result of high intention, sincere effort, Intelligent direction and skillful execution;
It represents the wise choice of many alternatives

uapo4

  • Posts: 559
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #7 on: March 01, 2005, 08:22:53 PM »
Ndi ibem, nwoke na nwanyi, ekenem unu!
O nwere ihe di mkpa nsi ka m jua unu: o nwere mahadum na nee anyi maka iweputa okwu ohu n\'Igbo? Ihe m ji aju bu na uwa na ga n\'ihu mana asusu anyi bu igbo enweghi ihe gosi m na o na eweputa okwu ohu dika otu anyi ga esi we kwuo \"computer\", \"sugar\" na asusu anyi.  Ihenwa di mkpa obulu na anyi ga na ga n\'ihu na asusu Igbo.
"Incline Thy ear, O Lord, and hear me: for I am needy and poor" -- Psalm lxxxv. 1

Honeybunnie

  • Posts: 714
Nkata Igbo
« Reply #8 on: March 01, 2005, 08:32:57 PM »
Uzo, amaghi m edee na igbo, man agama try.....ikwutere ya, anam eche echiche na udi ihe ikwuru. Gini mere na asusu anyi anaghi aga ihu. Echi ngara aga, ana m ekwusara nne m okwu na igbo maka ona \"like\"....inum ikwu na igbo, ka o chiara m ochi....achoburu m isi \"on-line\", ma cheta na anyi enwere on-line na asusu anyi. Mana anuru m na onwe nwoke, na ala Amerika a, nna edeputa asusu anyi ohuru, unu ama onye ana m ekwu maka ya....

\"I hope na unu ga enwe ike guo ihe ni le a, edere m\"

uapo4

  • Posts: 559
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #9 on: March 01, 2005, 08:50:06 PM »
A gutaram ihe ide ofuma! A ga m acho i ma onye bu nwoke no n\'ana bekee ebe na edeputa okwu ohu n\'Igbo.
"Incline Thy ear, O Lord, and hear me: for I am needy and poor" -- Psalm lxxxv. 1

Honeybunnie

  • Posts: 714
Nkata Igbo
« Reply #10 on: March 01, 2005, 09:11:18 PM »
a reserachuolam okwu m kwutere, mana onwere ihe no na ebe obula maka onye nwoke a, O di ka ekwusiala m, mana ama m, na anuru ihe di ka ihe ahu. Mana, mchoputa maka yah, aga m edeputa ya na ebe a.

Kedu maka Prince, na Dr. Festus, unu nabu kwesiri ijiketa isi, choputa otu anyi ga e tinye udi okwu di ka \"computa\" na \"on-line\" na asusu anyi. Ama m , na unu bu ndi supu, aga m ano unu na azu ma unu e winne Nobel Prize..... :lol:  :lol:  :wink:  :wink:

\"I hope na unu ga enwe ike guo ihe ni le a, edere m\"

chizor

  • Posts: 191
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #11 on: March 01, 2005, 09:47:17 PM »
honeybunnie! a chigbuola m onwe m n\'ochi. kedu nke bu \"researchuolam\" na \"hope\" eh??? :lol:  egwuregwu ka m n\'egwu maka na mu na onwe m amaghi otu m gede ya n\'asusu igbo.
Whenever I see an old lady slip and fall on a wet sidewalk, my first instinct is to laugh. But then I think, what if I was an ant, and she fell on me. Then it wouldn\'t seem quite so funny.
--Jack Handey,

uapo4

  • Posts: 559
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #12 on: March 01, 2005, 10:13:40 PM »
\"hope\" bu \"nchekube\"
\"research\" bu \"i cho si ihe ike\" :lol: Anyi nile na eme ofuma.
Ndi be anyi, okwa ezi okwu ka m kwuru? 8)
"Incline Thy ear, O Lord, and hear me: for I am needy and poor" -- Psalm lxxxv. 1

Honeybunnie

  • Posts: 714
Nkata Igbo
« Reply #13 on: March 01, 2005, 10:39:32 PM »
Chizor, nne m, ama m na ona mee mmadu chi ochi...I nuu ebe m na traiiiri isu yah na onu, i ga dapu, rolluo na afo gi, Bf m na dapu nochi mgbe obula m choro ikwusara yah na Ibgo n\'ebe ndi anaghi anu yah no. Mana, emme la m improve ma chi. Kedu ebe Prince gara biko nu. Uzoma, inwu ama ala na asusu anyi, aga m entinye ihe niile ikwuru na \"vocabulary\" m.

Susia

  • Posts: 301
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #14 on: March 01, 2005, 11:21:37 PM »
Ndi be anyi, ekele m unu!!!!!!!!

Tsly, ya di kwara gi na nma, ihe oma nke a echetara atogbuo la onwe ya.
Gini kpatara iji cheta o dika  ihe a??? o gosiri na i bu nwa afo Igbo. I bu aka aja  aja na ebute onu nmanu nmanu.

Yvonne, shi kwa agi shi. Mgbe n\'agu ihe e dere, ochi ekweghi m guchaya. e sim n\'elu oche ebe m no daa n\'ala, obere ihe ka meruo ahu ebe m n\'agu ihe edere. Biko nu ole nke bu \"researchuolam\" \"rolluo\" \" like\". O dika ibu onye oji na ya di ocha. Ana m eweliri gi ka elu n\'ihi na e gbaliri nke oma mana o raram ahu ighota ihe i na ede. Jisie ike nwanne m nwanyi. Ugbua kam ghotara ihe mere nne gi ji achi gi ochi ma i suwa ya bu igbo.

Chei Igbo a atogbuola m!!!!!!!!. Igbo ndi Owerre na ato m karicha. Ndi nwanyi nu nga, onye owerre o jiri ya owerre gba gi.( ihe o na ato ) O buru ndi bekee, ha shi o di \"sexy\". Ndi Owerre nu nga, ekelem unu.
Tupu ma e de cha,

Yvonne anam ario gi aririo biko achorom igu ihe ozo iga ede n\'igbo. I mere ka ubochi ga ofuma.
Begin with the determination to suceed and the work is half done already.