Igbo kwe nu!
Igbo a na acho-acho, kwe nu!
Igbo a na-eji a ga ogu, kwezuo nu!
Eeaaaah, he-he-hem.
Eeeem, dika unu ma, idi Igbo kwuru si, \"mma ekwu fue, onye huwara ji a puta.\"
Nna m siri, \"e kowe ulo, e kotere ndi oglogo.\"
Ihe mu na-acho i kwu bu nkea: Ihe nwanne anyi nwoke, bu Tsly, weputara n\'ebea di mma. Okwu Igbo dika oji, onye wetere ya, wetere ndu. Ugbua, Tsly e wetala ndu. A nam asi ka onye obula nyere m aka na-isi Tsly, \"ndewo\" maka ihe oma nke o wetara.
Ihe ozo m\'choro i kwu bu nkea. Okwu Igbo dika ji, i huwa ya ma i hugharighi ya, o refue n\'oku. A choro m ka onye obula were ohere nkea na-ahughari ji ya, ka o ghara irefu n\'oku.
Onye obula nye aka ka ihea Tsly bidoro ghara ida, n\'ihi na, e zue-ezue nyuo mamiri, o gbaa ufufu.
Ndewo nu.