Author Topic: Nkata Igbo  (Read 33297 times)

fagin

  • Posts: 70
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #15 on: March 02, 2005, 02:57:29 AM »
ADA na asi.... :lol:

Ndi sitia anyi a, kwenu!!  :P
Ri e nu!  :D
Nuo nu!!!!  :wink:
Kwezuo nu!!!!!  :P

...O bu ife nwute na nke a bu izizi a na m ede ife na ife a ana akpo \"forum\" ....gbagara nu m ooo. Efe adiro.....

O na enye m obi anuli na onye obula ma ede asusu igbo. Mgbe obula m na agu ife onye obula dere, obi na ato mu uto ifu na onye obula no ebe nwelu ike ikpa nkata n?igbo. Ife na ewute m bu na, enwerom ike etinye rikom ebe rikom kwesiri idi. Tupu a rapu unu, a cholom iji oge a, kene nwanne anyi nwoke bu tsly. Nna, dalu oooo?jide nke iji. Biko nu, ewezuga na m bu onye Anambra, a ma m n?unu ga aghota ife ndere. O ka ohamoooo!!!!! Udo diri unu.
"The first and final kiss is the one that creates the ultimate symphony of love"

chizor

  • Posts: 191
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #16 on: March 02, 2005, 03:04:38 AM »
Asusu ndi Anambara na ato m uto nke ukwuu. o n\'ato uto n\'nti. Ada, biko suwa nnoo.
Whenever I see an old lady slip and fall on a wet sidewalk, my first instinct is to laugh. But then I think, what if I was an ant, and she fell on me. Then it wouldn\'t seem quite so funny.
--Jack Handey,

uapo4

  • Posts: 559
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #17 on: March 02, 2005, 03:14:23 AM »
Nna meee! A si m ka mara onye n\'asu asusu di ka m no be nna m. Asusu Ada amaka m. A choro m igu asusu Igbo na obodo nine.
"Incline Thy ear, O Lord, and hear me: for I am needy and poor" -- Psalm lxxxv. 1

fagin

  • Posts: 70
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #18 on: March 02, 2005, 04:09:33 AM »
Uzoma, kita ka m choputara na mu na gi nwanne. chi moo.... Uwa nke a pere mpe. Nna kedu ije? ke kwanu?...kedu ife neme nu?.

Chizor nwanne m nwanyi, nne otekwana m nudebere onu gi. aru odikwa? a ana m ekene ooo. Kpotuorom mgbe obula ijiri nwe efe oo. e ma na obodo oyibo nke anyi a siri nno ike. Ngwanu nu ooo, emesie anyi ga afu.
"The first and final kiss is the one that creates the ultimate symphony of love"

uapo4

  • Posts: 559
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #19 on: March 02, 2005, 07:19:52 AM »
O di egwu. Ife n\'aga ofuma mana olu di. A choro m ikwu ka ijisike na ihe n\'eme. Otua ka m na ekwu kwa maka ndi niile ga gu ihe m dere. Ka odi mgbe ozo.
"Incline Thy ear, O Lord, and hear me: for I am needy and poor" -- Psalm lxxxv. 1

Honeybunnie

  • Posts: 714
Nkata Igbo
« Reply #20 on: March 02, 2005, 09:58:05 AM »
unu niile ekwu mala. Asusu Anambra buu kwa kpookpo. Ada, kedu ebe Anambra isi. Ndi niile mu na ha kpara nkata na Nsukka wu ndi Anambra. Man unu ma, asusu na so m ochi mbosi obula anuru m yah. Asusu ndi owerri. Asusu ha di doti, \"lacha\" na udi okwu otu ahu. Asusu ndi Ohafia di kwa egwu, ohafia na echeta m maka story ana m anu, na ha erriri ndi ocha. Asusu igbo dikwa egwu, ka onye ma asu na ede owerri na ohafia kwesiri e deputa ha ebe a. Ihe tsly bidoro na eme m ohu uto.

\"I hope na unu ga enwe ike guo ihe ni le a, edere m\"

Susia na Chizor, e hopuru m na asuputara m yah na nka m dere.

Prince

  • Posts: 438
Nkata Igbo
« Reply #21 on: March 02, 2005, 11:59:30 AM »
Umu nne m na umu nna m, unu a boola chi? Honeybunnie, a no m ya, na-anu olu gi. Okey, Chizi, Uzoma, Susia, Chizor, na Fagin, aka m di n?elu.  A na m e kele-e-o-o.

A nom n?ebe a, n?elu komputa, na-ekeri ekereke ochi.  Mkpiri n?ile na-ara m ahu. Nkata Igbo a bu ihe mmuta, ihe ozizi, burukwa ihe ekereke ochi, nke ndi bekee na-akpo komedi. A maghi m na nwanne m nwanyi bu Honybunnie bu ezigbo onye komedian.

Ka egwuru-egwu fee azu, ihe a Tsly bidoro bukwa ihe bara na nne, ihe ndi bekee na-akpo sirios.  A guchaala m, ghota kwa ihe onye obula dere n?ebe a.  A laturu m azu, na-ele otu oha-na-eze ji e we Nkata Igbo a.  O na abu, ura towa uto, e kwowe ya ekwowe (when sleeping gets too good, snoring begins).  O di ka ura ahu na-ato ezigbo uto.

Nke abuo, ihe a bu nwa Tsly. O bu ya muputara ?Nkata Igbo.? Dika ndi oke mmadu kwuru, ?o bu onye nwe ozu, na-ebu ya n?ishi?(it is the owner/family member of the corpse, who gets to carry it when it begins to smell).  Unu makwaara na onye nwe ihe na-eri ka nti gbawaa (the owner eats the lion?s share).  Ya mere nkita jiri si, na ya kpa ihe n?aka ebe ya na-ele otu aka nna ya ukwu si-aga (that?s why the dog said, he is busy watching the movement of his master?s hand).  O bu Tsly ga-ekwu ebe o choro ka ugbo a gaa.

Kama, o bu oge ndi dika Honeybunnie kpokuru m, ka m jiri cheta na, ejula bu nke nwatakiri n?ohia, kama e ruo n?ulo, ndi oke mmadu e werekwa ejula (the snail belongs to the child in the forest, but once home, the snail becomes the adults?).  Ka iwe ghara iwe Tsly, o ma na nwunye Onye-isi ala Amirika, bu Odozie-aku Sineto Hilary Clinton dere n?akwukwo, ?O bu mba na-azu nwa: It takes a village to raise a child.?

N?ihe nile e kwuru n?ebe a, ishi okwu ato ka m ji aka.  Nke mbu, Nwanne anyi bi Chizi kwutere ihe gbasara ilu igbo.  O kwuru si na o di mma ka a na-atu ilu n?ebe a, kama, onye tua ilu, ya jisie ike kowaa ya, ka ndi ozo were muta.  I ji gbusuo ufe, ya a tuo ilu nke ya.  Okwu ya dara dim.  Unu maara na shi (nshi) a naghi a gawa ije ghara mamiri (excrement never travels without urine). Dika nwanne anyi ahu kwukwara, ilu bu mmanu e ji eri okwu.  Onye obula gbaa mbo, na-atu ilu.

Nke abuo, Uzoma, onye aha ya bukwa Uapo4, mara okwa gbasara onye obu na-enye aka n?iroputa okwu igbo ohuru.  A maara m na e nwere ndi a hoputara n?obodo anyi bu Naijuria.  Oru ha a dichaghi m obu uto.  Kama, ihe m nwere ike itinye n?ebe ahu bu, o di out nwoke a na-akpo Mazi Onyema Nwazue.  Ebe obibi ya na mbasara uwa bu www.ilc.igbonet.com. O na-akuzi okwu igbo n?ebe ahu.  Onye nwere ajuju obula, nwere ike i denye aha ya dika e si e denye ya n?ebe a.  O denye aha ya, o nweziri ike i jiri i-melu deje ajuju ya.

Nke ato bu, umu nne anyi ndi nwanyi na-agba mbo i kwado Nkata Igbo a karia ndi nwoke.  Unu jisie ike, o ga a diri unu mma.
He who knows not, and knows not that he knows not, is a fool.

If you s-m-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-l-l-l-l-l-l-l what the Prince - is - cooking!!

(Adapted from WWE’s Rock.)

chizor

  • Posts: 191
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #22 on: March 02, 2005, 06:48:22 PM »
Yvonne! i di egwu!!! nkata gi bu noo \"wan in town!\" i bu ezigbo onye ochi, otu nwanne anyi prince shiri wee kwo.  

Ada nwanne m! kedu ka imere. eji m aka na ahu di gi nma. nwanne gi nwanyi kwanu? biko kelera m ya.
Whenever I see an old lady slip and fall on a wet sidewalk, my first instinct is to laugh. But then I think, what if I was an ant, and she fell on me. Then it wouldn\'t seem quite so funny.
--Jack Handey,

tsly

  • Posts: 58
Nkata Igbo
« Reply #23 on: March 04, 2005, 06:34:31 AM »
Chie!!! mma mma nu ooo! Ewuuuuuu!

Ekele m unu maka okwu oma unu. Anwuri anyi na enweta na nakata anyi na kpa bu maka mmadu dum nyere aka.

Afurum na enwere ndi na ede ife na bekee. Nsogbu anoghi, anyi ma na asusu anyi, enwere oge okwesiri na ga etinye ya okwu ndi oyibo.

mma mma nu o!

tsly

  • Posts: 58
Nkata Igbo
« Reply #24 on: March 04, 2005, 06:45:30 AM »
Quote from: \"chizor\"
Asusu ndi Anambara na ato m uto nke ukwuu. o n\'ato uto n\'nti. Ada, biko suwa nnoo.


eziokwu ka ikwuru, ma na asusu ndi owerri rikwa mma. :lol:

uapo4

  • Posts: 559
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #25 on: March 04, 2005, 07:55:27 AM »
Ndi be anyi, ekene m unuo! A ga m acho ka enwe ilu di iche iche dika \"ututu ka eji acho ewu oji\". A ma m na unu niile ma ihe m na ekwu maka ya. Jisienu ike.
"Incline Thy ear, O Lord, and hear me: for I am needy and poor" -- Psalm lxxxv. 1

Prince

  • Posts: 438
Nkata Igbo
« Reply #26 on: March 04, 2005, 09:05:21 PM »
Ndi Igbo no n\'ebe a, ndewo nu.  Ihe Tsly kwuru gbasara ndi na-ede ihe n\'olu bekee n\'ebe a, bu ezi-okwu.  A bu m otu onye na-eme otu ahu.  Dika unu maara, awo a naghi agba oso ehihie n\'efu.  Ihe mere mu ji ede otu ahu bu ndi a:

Nke mbu:  Unu guru ihe Chizi dere gbasara ilu na ntapia ya.  Okwu ahu bu okwu di mkpa.  Udi ihe ahu ga-eme ka onye na-amaghi okwu Igbo nke oma, nwee ike i muta.  E cheere m na Tsly gaara e tinye aririo ahu onu.  Ya mere, rue oge o ga e kwu okwu banyere ya, a ga m abali i de ilu, tapiakwaa ya.

Nke abuo:  Unu makwaara na okwu igbo ezuchaghi ezu.  Ufodu okwu bekee a dighi n\'igbo.  Ya mere ka Uzoma jiri kwuo okwu ndi na-aroputa okwu igbo ohuru.  Oge ufodu, igbo na-emekwa ihe asusu ndi ozo na-eme.  Ya bu i gwagbu okwu ndi ozo i ji weputa okwu nke ha.  Otutu okwu bekee si na French, Latin, Spanish, na ndi ozo.  O buru okwu anyi na-enweghi n\'olu igbo, anyi nwere ike i de ma obu sua ya n\'olu ndi nwe ya, karama anyi ga-ejiri uda ya supee ya.  \"Computer\" jiri buru komputa, \"spell\" bu supee, television bu \"tiivi,\" echetaram-echetaram (etc, etc).

Ya ka m choro i kowa.  Daalu nu.
He who knows not, and knows not that he knows not, is a fool.

If you s-m-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-l-l-l-l-l-l-l what the Prince - is - cooking!!

(Adapted from WWE’s Rock.)

okey

  • Posts: 220
Nkata Igbo
« Reply #27 on: March 06, 2005, 05:05:25 AM »
Umunne na umunna, mma mma nu o!

Aguchala m ihe unu dere.

Ajuju mu na ju bu, kedu ihe mere ndi igbo, tupu ha ekwu okwu, ha ekele onyeobula?

O bu ihe oma
===
Quality is never an accident; It is always the result of high intention, sincere effort, Intelligent direction and skillful execution;
It represents the wise choice of many alternatives

uapo4

  • Posts: 559
    • http://
Nkata Igbo
« Reply #28 on: March 06, 2005, 05:12:19 AM »
O bu maka n\'obu omume ndi b\'anyi. O bu etu e si wee zu anyi. Nya butere na ibia hu onye b\'anyi na onye obodo ozo, iga hu ihe di iche. Ihe gbasala ikene ndi madu bu soso ohu ihe. Enwekwara ihe ndi ozo di iche iche. Ewuu, ewuu, ewuu, a hukam ndi Igbo anyi n\'anya. Chukwu gozie anyi na obodo ndi ozokwa. Ka odiba mgbe ozo.
"Incline Thy ear, O Lord, and hear me: for I am needy and poor" -- Psalm lxxxv. 1

Prince

  • Posts: 438
Nkata Igbo
« Reply #29 on: March 06, 2005, 08:05:07 AM »
Igbo no n\'ogbako a, e kelee m unu.

Mmhh-hh-hhhmm.  Ajuju Okey juru di mma.  Ndi Igbo turu ilu si, \"Onye ajuju a naghi e fu uzo\" (One who asks for direction never gets lost).  Ajuju a ga-akuziri ya otu ihe ma obu abuo, kuzikwaara ndi ozo no n\'ebe a na-amaghi.

O bu ezi-okwu na Uzoma a saala ajuju ya, karama, a ga m e nyeturu ya ntakiri aka.

Ekele bu ihe ukwu n\'ala Igbo.  I teta ura n\'ututu, ihe mbu i kwesiri i me bu i kele ekele.  I bia n\'ulo mmadu, i ga e kele onye ibiara n\'ulo ya, ya e keleekwa gi.  I zuo mmadu n\'uzo, i ga e kele ya, o keleekwa gi.  Otu a ka o di ma i hu onye no n\'ubi, ndi no n\'ogbako, ma obu onye na-aria oria.

Nke a mere ekele jiri burukwa ihe onwu na ndu; onwu/ndu nke gi ma abu nke onye ozo.  N\'agba ochie, tutu ndi bekee e weta ochichi na okwu chukwu ha, ndi Igbo na-alukarita ogu, na-egbukarita onwe ha, na-emekaritakwa onwe ha nshi.  Ihe ntakiri na-ebute ogu ma obu iro n\'agbata ezi-na-ulo abuo, ama abuo, ma obu mba abuo.  Nke a mere onye Igbo abula na-agba mbo, otu ike ya ha, ka o ghara i bute iro na-agbata ya na onye agbata-obi ya.

Enyi, ma obu i nwe enyi, bu ihe ukwu n\'ala Igbo.  O bu site n\'ekele ka e ji e nwe enyi.  Enyi dika ogba; onye nwere otutu enyi, ihe a naghi a ra ya ahu nke ukwuu.  O na-arakwa ahu mmadu i gbu ya, n\'ihi otutu mmadu ga-agwa ya oge a na e kwu okwu ojoo ma obu oge a na e nwe uzuka gbasara i gbu ya.  Oburu na e mesi ya okwu n\'uzo, ma obu n\'mba, ndi enye ya ga-abia zoputa ma obu nyere ya aka.  Odachi ego ma obu mkpa ozo biara ya, ndi enyi ya a gaghi e kwe ka ihe ahu merie ya.  Ya mere ka ndi Igbo na-asi, \"onye nwere mmadu ka onye nwere ego.\"

Ekele bu ihe nkuzi, burukwa ihe mmuta.  Site n\'ekele ka i ji e gosi ihe no gi n\'obi, were ya matakwa oye iro gi.  Oburu na i kelezighi mmadu ekele nke oma, o chee na i na e rosi ya iro ma obu hu ya n\'iro.  O burukwa na i kele mmadu ma o kelezighi gi nke oma, i jiri nke ahu mara na obi ya a dighi mma n\'ebe i no.  Ya mere Igbo ji a si, \"e kwee ekele, ihu a saa.\"

N\'ala Igbo, ekele-aka bu eze ekele.  Dika ndi dibia bekee (dokita ma obu noosu) ji e ji mkpuru aka a mata otu obara si a ga n\'ahu mmadu, otu ahu ka ndi Igbo ji e ji ekele-aka a matakwa obi mmadu.  Onye obula batara n\'ogbako, ga-ekwezu onye obuola no n\'ebe ahu n\'aka.  Otu i si kwesie mmadu ekele-aka ike na-egosi onye ahu ihe di gi n\'obi.

Ihe di otutu ka m nwere ike ide gbasara ekele.  Kama, a ga m a kwusi n\'ebe a.  E ji m aka na unu a ghota ebum n\'obi m.

Ndeewo nu.
He who knows not, and knows not that he knows not, is a fool.

If you s-m-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-e-l-l-l-l-l-l-l what the Prince - is - cooking!!

(Adapted from WWE’s Rock.)